Otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum, bụ ndị e jiri ASUU mara n’aha ịchafụ, enwena nzukọ ịkpa ụbụbọ maka ịkwụsị abụbọ-ọrụ ahụ ndi otu ahụ na-agba. Ịkpa ụbụbọ ahụ na-aga n’ihu n’Abuja, isi obodo ala Naịjiria. Ndị sonyere na ya bụ ndị ọnụ na-eru n’okwu n’otu ASUU yana ndị nnọchite anya gọọmenti etiti.
Onye minista na-ahụ maka ọrụ na mmeputa akara ngwa bụ Sinetọ Chris Ngige kwuru na gọọmenti akpọla ọtụtụ nzukọ maka ịleba anya na nsogbu abụbọ ọrụ ndị ASUU ahụ.
Minista na-ahụ maka mmuta, bụ Adamu Adamu, kwenyere n’otu abụọ a ga ekwekọrịta, nwekwe ike meek a ụmụ lọghachi, malite ịgukwa akwụkwọ ọzọ.
Onye isi otu ASUU, bụ ọkammuta Biodun Ogunyemi, kwuru na e mezicha ịhe etu kwesịrị ekwesị, ndị isi ASUU ga-enwe nzukọ were mara ịhe ọzọ ha ga-eme.
ASUU malitere ịgba abụbọ-ọrụ n’abalị iri na anọ nke ọnwa Ọgọstụ, afọ puku abụọ na iri na asaa. Iwe ha bụ akwụghị ụgwọ ọnwa ndị nkuzi mahadum yana ego mmawapụta maka ịrụ ọrụ na mahadum ala Naịjiria.