Ọkụ dị oke egwu agbarikọọla ngwa ahịa gburu ego ruru nde kwuru nde naịra n'ahịa ọgwụ dị n'Ọnịcha. Ya bụ nnukwu ọkụkụ, bụ nke malitere n'elekere isii nke isi ụtụtụ ụbọchị Satọdee gara aga, ma bụrụkwa nke gbarigoro ọtụtụ ihe tupuu ndị ọrụ nsọnyụ nọ na mpaghara ahụ wee gbatazie ọsọ enyemaka ebe ahụ iji wee gbochie ya bụ ọkụ ịba n'ọdụ ahịa ndị ọzọ.
Ọtụtụ ndị nke ahụ metụtara bụkwa ndị kwara akwa nke ukwu dịka ụmụaka, ọbụnadị dịka onyeisi n'ọdụ ahịa ahụ, bụ maazị Sunde Obinze kwuru na nke ahụ ebiela ha aka ọjọọ ma mekwa ka ọnọdụ kara njọ, ọ kachasị n'oge ekeresimeesi a.
O kwuru na ya bụ ọkụ ka na-agba vuu vuu oge ya na ndị otu ya gbataruru ebe ahụ, nke mezịrị ka ya na ode akwụkwọ ya malitezie inyere ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ aka n'ịgbanyụ ya bụ ọkụ.
Ka ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu, otu onye n'ime ndị ajọ ọnọdụ ahụ metụtara, bụ maazị Chidubem Ụzọchukwu kwuru na ọ tụfuru ego ruru narị Naịra asaa, tinyere ngwọ ahịa gburu ọnụ ego karịrị nde Naịra iri na ya bụ ọkụ ọgbụgba.
N'aka nke ya, onyeisi otu jikọrọ ndị na-azụ ahịa ọgwụ n'ahịa ahụ bụ maazị Uche Eze kwuru na ọ bụ n'isi ụtụtụ ka ndị ọrụ nchekwa kpọrọ ya ma mee ka ọ mara banyere nke ahụ, bụzị nke mere ka ọ kpọọ ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ nọ na nnukwu ahịa Ọnịsha na ndị nke nọ n'ahịa akụrụngwa e ji arụ ụlọ dị n'Ogidi, bụkwa ndị gbaara ozigbo ahụ gaba ebe ahụ, nke mezịrị ka ya bụ ọkụ ghara ịgbasa nke ukwu.